John 6:51 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Abụ m nri na-enye ndụ nke si nꞌelu bịa. Onye ọ bụla na-eri nri a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Nri nke m na-enye bụ anụ ahụ m, nke e nyere maka ịgbapụta ụwa nile.”
Igbo 2006
Mu onwem bu nri di ndu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n'ihi ndu nke uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.”