John 7:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụbọchị izuike unu na-ebi nwa ọhụrụ ugwu ka a hapụ imebi iwu Mosisi. Gịnị mere unu ji ewe iwe nꞌihi na m mere ka ahụ dị mmadụ mma nꞌụbọchị izuike?
Igbo 2006
Ọ buru na ebì madu úgwù n'ubọchi-izu-ike, ka ewe ghara imebi iwu Moses; ùnu nwere òlùlù ọjọ n'arum, n'ihi na emerem ka aru dichasia otù madu nma n'ubọchi-izu-ike?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike?