John 7:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị isi ndị Juu jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Ebee ka ọ na-akwado ịga? Ọ̀ bụ ijekwuru ndị Juu nọ na mba ọzọ soro ha nọdụ na-ezi ndị mba ọzọ naabụghị ndị Juu ihe?
Igbo 2006
Ya mere ndi-Ju siritara onwe-ha, Òle ebe Onye a gaje iga na ayi onwe-ayi agaghi-achọta Ya? Ọ̀ gaje igakuru ndi b͕asara n'etiti ndi-Grik na izí ndi-Grik ihe?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe?