John 8:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs guzoro ọtọ lee anya gburugburu, o nweghị onye ọ bụla ọ hụrụ karịa nanị nwanyị ahụ. Jisọs jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị, “Olee ndị ahụ kpọtara gị nꞌebe a? Ò nweghị onye ọ bụla nꞌime ha mara gị ikpe?”
Igbo 2006
Jisus we welie Onwe-ya elu, si ya, Nwanyi, òle ebe ha nọ? ọ̀ dighi onye ọ bula mara gi ikpé?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?”