John 8:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “Mụ onwe m bụ onye na-enye ndị bi nꞌụwa ìhè. Onye ọ bụla sooro m agaghị ejegharị nꞌime ọchịchịrị, kama ìhè ahụ ga-anọnyere ya ruo mgbe ebighị ebi.”
Igbo 2006
Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n'ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”