John 8:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụ eziokwu na m na-agbara onwe m ama, ma ama m na-agba bụ eziokwu. Amaara m ebe m si bịa, amakwara m ebe m na-aga. Ma unu onwe unu amaghị ihe ndị a nile.
Igbo 2006
Jisus zara, si ha, Asi kwa na Mu onwem b͕ara Onwem àmà, àmà nkem bu ezie; n'ihi na amataram ebe M'siri bia, na ebe M'nāla; ma unu onwe-unu amataghi ebe M'si bia, ma-ọbu ebe M'nāla.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga.