John 8:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ ha jụrụ Jisọs sị ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zaghachiri ha sị, “Ebe unu na-amaghị onye m bụ, unu apụghị ịmata onye Nna m bụ. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.”
Igbo 2006
Ya mere ha si Ya, Òle ebe Nna-Gi di? Jisus zara, si, Unu amataghi m, unu amataghi kwa Nnam: ọ buru na unu mataram, unu gāmata-kwa-ri Nnam.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.”