John 8:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌechi ya, nꞌisi ụtụtụ, ọ banyere nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke. Mgbe na-adịghị anya, ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ bịakwutere ya, gbaa ya gburugburu. O guzoro nꞌetiti ha malite izi ha ihe.
Igbo 2006
O we bia kwa ọzọ n'isi-ututu n'ulo uku Chineke, ndi-Ju nile we biakute Ya; O we nọdu ala, we nēzí ha ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe.