John 8:28 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi nke a, Jisọs dọrọ ha aka na ntị sị, “Mgbe unu mere ka m nwụọ, unu ga-amata na unu egbuola Onye nzọpụta ahụ, bụ onye Chineke zitere. Unu ga-amatakwa na ihe nile m gwara unu esiteghị nꞌuche m kama ha bụ ihe nile Nna m chọrọ ka m gwa unu.
Igbo 2006
Ya mere Jisus siri, Mb͕e ọ bula unu gēweliwori Nwa nke madu elu, mb͕e ahu ka unu gāmara na Mu onwem bu Ya, na ọ dighi kwa ihe M'nēme n'Onwem, kama dika Nnam zírim, otú a ka m'nēkwu ihe ndia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a.