John 8:44 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Onye na-eme ihe dị otu a bụ nna unu ekwensu. Unu na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu nꞌihi na unu na-eme ihe nile na-atọ ya ụtọ. Ekwensu bụ ogbu mmadụ site na mbụ. Ọ kpọrọ eziokwu asị nꞌihi na eziokwu ọ bụla adịghị nꞌime ya. Ọ na-anyakwa isi mgbe nile, nꞌime ụgha nile, nꞌihi na ọ hụrụ ịgha ụgha nꞌanya. Ọ bụkwa nna nke ndị nile na-agha ụgha.
Igbo 2006
Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha.