John 8:46 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Onye nꞌime unu nile pụrụ ibo m ebubo mmehie ọ bụla? Ọ bụrụ na unu apụghị ịkwagide na m bụ onye mmehie, gịnị mere unu jiri jụ ikwere nꞌokwu m nile? Ihe nile m na-ekwu bụ eziokwu.
Igbo 2006
Ònye nime unu turum nmehie n'anya? Ọ buru na M'nēkwu ezi-okwu, n'ìhi gini ka unu onwe-unu nēkweghm?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O nwere onye nʼime unu pụrụ ịtụ m mmehie m nʼihu? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere unu ekwenyeghị na m?