John 8:52 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị isi ndị Juu ahụ sịrị, “Ahaa! anyị maara ugbu a na ị bụ onye isi mebiri. Eberaham na ndị amụma nile a maara aha ha nwụrụ kemgbe oge dị anya. Ma gị onwe gị na-asị na onye ọ bụla kweere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo 2006
Ndi-Ju siri Ya, Ub͕u a ka ayi mara na I nwere mọ ọjọ. Abraham nwuru, na ndi-amuma; ma Gi onwe-gi nāsi, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi.