John 8:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha kwuru okwu ndị a ile ma ha gaesite nꞌọsịsa Jisọs ga-enye ha boo ya ebubo ịkwagide mmebi iwu. Ha gere ntị ka ha nụrụ ihe Jisọs ga-ekwu. Ma ebe ọ bụ na Jisọs matara echiche obi ha, ọ gwaghị ha ihe ọ bụla. Kama o huuru ala were mkpịsị aka ya dee ihe nꞌala.
Igbo 2006
Ma nka ka ha nēkwu inwa Ya, ka ha we nwe ihe ha gēji bo Ya ebubo. Ma Jisus ruru ala, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala.