John 8:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ha nọgidere na-esogbu ya ka okwu si ya nꞌọnụ pụta, Jisọs lelitere anya ya elu gwa ha sị, “Unu nwere ike tụọ nwanyị a nkume ugbu a. Ma achọrọ m ka onye ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume bụrụ onye nke na-emebeghị mmehie nꞌoge ọ bụla.”
Igbo 2006
Ma mb͕e ha nọgidere nāju Ya, O welie Onwe-ya elu, si ha, Onye akēmehieghi n'etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.”