John 9:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ ndị Farisii sịrị, “Ọ bụghị Chineke zitere nwoke a a na-akpọ Jisọs. A sị na ọ bụ onye Chineke zitere, ọ garaghị arụ ọrụ nꞌụbọchị izuike.” Ndị ọzọ nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ dị otu a?” Nkewa batara nꞌetiti ha.
Igbo 2006
Ya mere ufọdu n'etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n'ebe Chineke nọ, n'ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n'etiti ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.” Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha.