John 9:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ. Ha ziri ozi ka a kpọọ ndị mụrụ ya.
Igbo 2006
Ya mere ndi-Ju ekweghi okwu bayere ya, na o kpururi ìsì, na eme-kwa-ra ya ka ọ hu uzọ, rue mb͕e ha kpọrọ ndi muru onye ahu emere ka ọ hu uzọ,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ, nke e mere ka ọ hụ ụzọ, tutu ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ ya.