John 9:41 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs zara sị ha, “A sị na unu kpuru ìsì, unu agaraghị enwe mmehie. Ma ugbu a unu na-asị, ‘Anyị na-ahụ ụzọ.’ Nꞌihi ya, mmehie unu naadịgide.”
Igbo 2006
Jisus siri ha, Ọ buru na unu kpuru ìsì, unu agaghi-enwe nmehie: ma ub͕u a unu nāsi, Ayi nāhu uzọ: nmehie-unu nānọgide.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, ikpe ọmụma mmehie agaghị ama unu, ma ugbu a ebe unu sị na unu na-ahụ ụzọ ikpe ọmụma unu na-adịgide.”