Joshua 10:32 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Jehova we nye Lekish n'aka Israel, o were ya n'ubọchi nke-abua, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya, dika ihe nile si di nke o mere Libna.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Onyenwe anyị nyefere Lakish nʼaka ụmụ Izrel. Joshua lụgburu ya nʼụbọchị nke abụọ ya. Ha weere mma agha ha tigbuo mmadụ niile bi nʼime ya, dịka ha mere Libna.