Joshua 11:21 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n'ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n'Anab, na n'ugwu Juda nile, na n'ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi.