Joshua 13:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma Joshua ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; Jehova we si ya, I ghọwo agadi, ubọchi ndu-gi nāgwu, ma ala nke riri nne nke-uku fọduru inweta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge a, Joshua aghọọla agadi nwoke, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị ya, “Ugbu a, ị ghọọla agadi, ụbọchị ọgwụgwụ ndụ gị abịala nso, ma ọtụtụ ala fọdụrụ ndị a ga-emeri.