Joshua 13:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ndi nile bi n'ugwu site na Lebanon rue Mizrefot-maim, bú ndi Zaidon nile; Mu onwem nānapu ha ala-ha n'iru umu Israel: nání me ka ọ dayere Israel n'ihe-nketa, dika M'nyeworo gi iwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu.