Joshua 14:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Umu Juda we biarue nso Joshua nime Gilgal: Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, we si ya, Gi onwe-gi amawo okwu Jehova gwara Moses, bú onye nke Chineke, bayerem, baye-kwa-ra gi, nime Kedesh-banea.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge a, ụmụ Juda zipụrụ ndị ozi ndị jekwuuru Joshua na Gilgal. Kaleb, nwa Jefune, onye Keniz so ha nʼije a. Mgbe ha bịarutere, Kaleb gwara Joshua okwu sị ya, “I chetakwara okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis onye nke Chineke banyere gị na banyere mụ onwe m, mgbe anyị nọ na Kadesh Banea?