Joshua 17:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a bụ oke e kenyere ndị ebo Manase, bụ ọkpara Josef, ya bụ Makia ọkpara Manase, onye bụ nna nna ndị Gilead. Onye natara ala Gilead na Bashan, nʼihi na ndị agbụrụ Makia bụ dike nʼagha.