Joshua 18:8 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ndikom ahu we bilie, je: Joshua we nye ndi nēje ide ala ahu n'akwukwọ iwu, si, Jenu, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ, laghachikutem, m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, nime Shailo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, mgbe ndị ikom nledo ahụ gawara ijegharị nʼala ahụ niile, Joshua gwara ha okwu sị, “Jeenụ jegharịa nʼala ahụ niile. Depụtakwanụ otu unu chere a ga-esi kee ya nʼakwụkwọ. Mgbe unu lọtara aga m anọ nʼebe a bụ Shaịlo jụta Onyenwe anyị ase site nʼife nza, chọpụta ala nke ebo ọbụla ga-eketa.”