Joshua 19:51 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndia bu ihe-nketa, nke Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo ndi bu nna ebo umu Israel, mere ka eketa n'ife-nzà nime Shailo n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. Ha we kebìe ala ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị a bụ oke ala nke Elieza onye nchụaja, Joshua nwa Nun na ndịisi ụlọ ebo ụmụ Izrel, kere na Shaịlo site nʼife nza nʼihu Onyenwe anyị, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ha si otu a kebie ala ahụ.