Joshua 20:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ndia bu obodo akara àkà bayere umu Israel nile, baye-kwa-ra ọbìa nke nānọ dika ọbìa n'etiti ha, ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu, ghara kwa onwu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọ Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel.