Joshua 22:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Otú ọ di, ọ buru na ala ihe-onwunwe-unu arua árú, gabigaranu onwe-unu rue ala ihe-onwunwe Jehova, ebe ebe-obibi Jehova nēbi, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe n'etiti ayi: ma unu anupula isi n'okpuru Jehova, unu anupu-kwa-la isi n'okpuru ayi, n'iwuru onwe-unu ebe-ichu-àjà nābughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na unu wuru ebe ịchụ aja ahụ nʼihi na ala unu rụrụ arụ, bịakwutenụ anyị nʼakụkụ nke ọzọ, nke osimiri a, ebe Onyenwe anyị bi nʼetiti anyị, nʼime ụlọ nzute obibi ya. Anyị ga-ekenyekwa unu ala anyị. Ma unu enupula isi megide Onyenwe anyị site nʼiwu ebe ịchụ aja ọzọ, ebe ọ bụ na e nwere otu ebe bụ ezi ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke anyị.