Joshua 22:27 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
kama ihe-àmà ka ọ gābu n'etiti ayi na unu, na n'etiti ọb͕ọ nile nke umu-ayi ndi gānọchi ayi, ka ayi we were àjà-nsure-ọku nile ayi, were kwa àjà nile ayi, were kwa àjà-udo nile ayi, fè òfùfè Jehova n'iru Ya; ka umu-unu we ghara isi umu-ayi n'ọdi-n'iru, Unu enweghi òkè nime Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kama, ọ bụ ebe ịchụ aja ịhụba ama nʼetiti unu na anyị, nakwa ọgbọ ndị nke ga-esote anyị, na anyị ga-efe Onyenwe anyị ofufe nʼụlọnsọ ya, site na ịchụrụ ya aja nsure ọkụ, na aja udo. Mgbe ahụ, nʼoge dị nʼihu, ụmụ ụmụ unu agaghị asị ụmụ ụmụ anyị, ‘Unu enweghị oke nʼime Onyenwe anyị Chineke.’