Joshua 22:33 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Okwu ahu we di nma n'anya umu Israel; umu Israel we gọzie Chineke, ha ekwughi kwa okwu irigokuru ha ibu agha, ibibi ala nke umu Reuben na umu Gad nēbi nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Okwu a tọrọ ụmụ Izrel ụtọ. Ha ṅụrịrị ọṅụ, too Chineke otuto. Ha ekwukwaghị okwu ibu agha megide ụmụ Ruben, ụmụ Gad na ụmụ Manase, banyere ibibi ala ha bi nʼime ya.