Joshua 24:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Joshua we chikọta ebo nile nke Israel rue Shekem, ọ kpọ ndi-okenye Israel, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha; ha we guzo onwe-ha n'iru Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke.