Joshua 24:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Jehova we chupu ndi ahu nile n'iru ayi, bú ndi-Amorait ndi bi n'ala nka: ayi onwe-ayi gēfè kwa Jehova òfùfè; n'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ Onyenwe anyị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.”