Joshua 4:23 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, mere ka miri Jọdan takọrọ n'iru unu, rue mb͕e unu gabigara, dika Jehova, bú Chineke-unu, mere Oké Osimiri Uhie, nke O mere ka ọ takọrọ n'iru ayi, rue mb͕e ayi gabigara:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ.