Joshua 6:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndi-nchu-aja asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e ahu: ma n'ubọchi nke-asa unu gāb͕a obodo ahu buruburu ub͕ù asa, ndi-nchu-aja gāfù kwa opì-ike asa ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị nchụaja asaa, ndị ga-eji opi mpi ebule asaa ga-ebu ụzọ gawa nʼihu. Ndị nchụaja ndị ọzọ ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ. Nʼụbọchị nke asaa, unu ga-agba obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe unu na-eme nke a, ndị nchụaja asaa ahụ ga na-afụ opi mpi ebule ha.