Joshua 7:14 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Agēme kwa ka unu biarue nso n'ututu n'ebo nile unu: o gēru kwa, na ebo ahu nke Jehova gānwude gābiaru nso n'ab͕uru nile ya; ab͕uru ahu nke Jehova gānwude gābiaru kwa nso n'ulo-ya nile; ulo ahu nke Jehova gānwude gābiaru kwa nso na ndikom-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Nʼụtụtụ echi, unu ga-apụta nʼebo nʼebo. Ebo ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta nʼikwu nʼikwu, ikwu ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta bịa nʼezinaụlọ nʼezinaụlọ, ụlọ ọbụla nke Onyenwe anyị họọrọ, ndị ikom ya ga-apụta nʼotu nʼotu.