Joshua 7:24 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Joshua, ya na Israel nile, we were Ekan nwa Zera, na ọla-ọcha ahu, na uwe-nwuda ahu, na nkpirikpi ọla-edo ahu, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na ehi-ya, na inyinya-ibu-ya, na ìgwè ewu na aturu-ya, na ulo-ikwū-ya, na ihe nile o nwere: ha we me ka ha rigorue Ndagwurugwu Ekoa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ.