Joshua 7:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Joshua we si, Gini mere i mekpaworo ayi aru? Jehova gēmekpa gi aru ta. Israel nile we were nkume ub͕ue ya; ha we sure ha n'ọku, were kwa nkume tub͕ue ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? Onyenwe anyị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.” Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ.