Joshua 8:31 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
dika Moses, bú orù Jehova, nyere umu Israel iwu, dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, bú ebe-ichu-àjà nkume zuru okè, nke ọ nēmeghi ka ígwè ga n'elu ha: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, chu kwa àjà-udo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu. O wuru ya dịka ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis si dị, ebe ịchụ aja a na-ejighị nkume a wara awa wuo, nkume a na-ejighị ngwa ọrụ igwe waa. Nʼelu ebe ịchụ aja a ka ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ na aja udo.