Jude 1:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ndị a sooro unu nọdụ iri oriri ịhụnanya unu ha dị ka ntụpọ ọjọọ nꞌetiti unu. Ọchị na-eju ha ọnụ mgbe ha ji nri na-afọju ọnụ ha, na-eri nri dị ka ndị ihere na-adịghị eme. Ha anaghị echekwa echiche banyere ndị ọzọ. Ha dị ka igwe ojii nke ikuku na-ebugharị, nke na-adịghị ezo mmiri. Ha na-ekwe nkwa elu na ala, ma ihe ọ bụla adịghị esi ha nꞌaka apụta. Ha dị ka osisi na-adịghị amị mkpụrụ, ọ bụladị nꞌudu mmiri. Ha bụ ndị nwụrụ anwụ, ndị e fopụrụ efopụ site na mgbọrọgwụ ha ka a kpọọ ha ọkụ.
Igbo 2006
Ndia bu ndi nke bu nkume zoro ezo n'oriri ihu n'anya unu mb͕e ha nēso unu rikọ ihe nātughi egwu, ndi nāzù onwe-ha dika aturu; ha bu igwe-oji nke miri nādighi, nke ifufe nēfeghari; buru kwa osisi nāmighi nkpuru n'oge nkpuru, nke nwuru anwu ub͕ò abua, nke eropuru eropu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ.