Jude 1:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Omume ha bụ nanị ihe na-eweta ihere na mmebọ, dị ka ụfụfụ ruru unyi nke ebili mmiri na-esi nꞌosimiri ebupụta nꞌelu ala. Ha na-ejegharị na-acha zaa dị ka kpakpando, ma ahụhụ dị na-eche ha bụ itiri na ọchịchịrị nke Chineke kwadobeere ha.
Igbo 2006
buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi.