Jude 1:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge nile. Ọ dịghị ihe na-adị ha mma. Ha na-eme ihe ọjọọ ọ bụla ha chọrọ ime. Ha na-anya isi, na-aja ndị ọzọ, ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nꞌaka ha.
Igbo 2006
Ndia bu ndi-ntamu, ndi nāta Chineke uta, nējeso agu ihe ọjọ nile ha (ọnu-ha nēkwu kwa oké okwu nāfuli afuli), ndi nāja iru madu n'ihi urù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge niile, ndị o nweghị ihe ọbụla na-adị ha mma. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. Ha na-anya isi banyere onwe ha, na-aja ndị ọzọ mma; ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nʼaka ha.