Jude 1:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Gbalịanụ ịzọpụta ụfọdụ dị ka a ga-asị na ọ bụ site nꞌọkụ ka unu si azọpụta ha. Ma nyekwaranụ ndị ọzọ aka ịchọta nzọpụta site nꞌigosi ha obi ebere. Kama kpachapụnụ anya ịhụ na mgbe unu na-enyere ha aka na ha adọkpụrụghị unu banye nꞌime mmehie ha. Mgbe unu na-enyere ha aka kpọọnụ ajọ omume ha nile asị.
Igbo 2006
nāzọputa-kwa-nu ufọdu, nāguputa ha n'ọku; ma werenu egwu mere ufọdu ebere; nākpọ ọbuná uwe anu-aru nyeworo ntupọ asì.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị.