Jude 1:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị m hụrụ nꞌanya, ọ gụọla m agụụ idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nꞌotu, ma a chọpụtara m na ọ dị mkpa ugbu a ịdọ unu aka na ntị ka unu na-agbalịsị ike ichebe okwukwe ahụ Chineke nyere ndị ya, ka a ghara ịgbanwe ya.
Igbo 2006
Ndi m'huru n'anya, ebe m'nānu ọku nile n'obi idegara unu akwukwọ bayere nzọputa ahu azọputakọrọ ayi, ọ dim nkpà idegara unu akwukwọ nāriọ unu ka unu nāb͕asi nb͕a ike n'ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n'aka nání otù mb͕e idebe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe.