Jude 1:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ụfọdụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-amaghị Chineke, abatala nꞌetiti anyị. Ndị na-ezi na onye Kraịst ọ bụla pụrụ ibi ụdị ndụ ọ bụla ọ chọrọ na-atụghị egwu ịta ahụhụ nke Chineke na-enye. Ha ajụla Jisọs Kraịst, Nna anyị ukwu na Onyenwe anyị. Ndị a bụkwa ndị ahụ akwụkwọ nsọ gbararị ama banyere ọmụma ikpe dị na-eche ha.
Igbo 2006
N'ihi na madu ufọdu b͕ebàra, bú ndi ewereworo ha gosi ọra madu mb͕e ochie ka ewe ma ha ikpé a, ndi nādighi-asọpuru Chineke, ndi nāgha amara Chineke-ayi ka ọ buru agu ikwa-iko, ndi nāgọnari kwa Onye nání Ya bu Nna-nwe-ọra, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe.