Jude 1:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chetakwanụ Sodọm na Gomora na obodo nile dị ha gburugburu. Obodo ndị ahụ jupụtara nꞌajọ omume dị iche iche, na ịkwa iko. Chineke mere ka ọkụ si nꞌelu bịa laa ha nꞌiyi, ime ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị, na ahụhụ nke ọkụ ebighị ebi, ebe a na-ata ndị mmehie ahụhụ, dị na-eche ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a.
Igbo 2006
Dika Sọdọm na Gọmọra, na obodo di ha gburugburu, ebe ha rara onwe-ha nye n'ikwa-iko n'uzọ di otú ndia mere, we pua so anu-aru di iche, edebewo ha n'iru ọra madu dika ihe-ngosi, nāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpé ziri ezi, nke bu ọku ebighi-ebi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi.