Jude 1:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ndị ozizi ụgha a na-aga nꞌihu na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ rụrụ arụ ha. Ha na-emerụ anụ ahụ ha, na-eji ndị nọ ha nꞌisi eme ihe ọchị. Ha na-akparịkwa mmụọ ndị ahụ dị ebube, bụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ dị ike, ndị hapụrụ ebe obibi ha.
Igbo 2006
Ma otú ahu madu ndia nēmeru kwa anu-aru-ha n'irọ-nrọ-ha, ju kwa ibu-onye-nwe-madu, kwulu kwa ndi nọ n'ebube.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.