Jude 1:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị a na-eme ihe Maikel, onyeisi ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe na-emeghị. Nꞌihi na mgbe mmụọ ozi Maikel chọrọ iburu ozu Mosisi, ya na ekwensu sere okwu. Ma mgbe ha naazọ ozu ahụ, Maikel ekwulughị ekwensu, kama ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị baara gị mba”.
Igbo 2006
Ma Maikael onye-isi-mọ-ozi, mb͕e ya na ekwensu nārurita uka banyere aru Moses, ka ọ nēkwugide ya, o nweghi anya-ike ikpe ya ikpé nkwulu, kama ọ siri, Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.”