Judges 11:34 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Jefta we bia Mizpa rue ulo-ya, ma, le, nwa-ya nwayi chiri egwú-otiti na ite-egwú nāputa izute ya: ma nání nwata ahu bu otù nwa o nwere; ọ dighi nwa-nwoke ma-ọbu nwa-nwayi o nwere ma-ọbughi nání ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ.