Judges 13:7 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
o we sim, Le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke; ma ub͕u a aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ rue ubọchi ọnwu-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kama ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Ma ugbu a, ị gaghị aṅụ mmanya vaịnị maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ, nʼihi na nwantakịrị ahụ ga-abụ onye e doro nsọ nye Chineke, site nʼime akpanwa ruo nʼọnwụ ya.’ ”