Judges 14:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nna-ya na nne-ya we si ya, Ọ̀ dighi nwayi di n'etiti umu-ndinyom umu-nne-gi, ma-ọbu n'etiti ndim nile, na gi onwe-gi nēje iluru nwunye sitere na ndi Filistia, bú ndi anēbìghi úgwù? Samson we si nna-ya, Lutaram ya; n'ihi na ya onwe-ya ziri ezi n'anyam.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?” Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.”