Judges 15:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Nnù ndikom Juda asa na ọgu iri we ridarue nb͕awa nkume di elu, bú Itam, si Samson, Ì maghi na ndi Filistia bu ndi nāchi ayi? gini bu kwa nka i meworo ayi? Ọ si ha, Dika ha merem, otú a ka m'meworo ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, ndị Juda zipụrụ puku ndị agha ka ha gaa jide Samsin nʼọgba nkume ahụ nke Etam. Ndị a bịara jụọ Samsin ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Ọ bụ na ị maghị na ndị Filistia na-achị obodo anyị?” Samsin zara sị ha, “Ihe m mere bụ imegwata ha ihe ha mere m.”